1 Chronicles 22

1Mgbe ahụ, Devid sịrị, “Ebe a ka a ga-ewuru Onyenwe anyị Chineke ụlọ, nakwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Izrel.”

Nkwado maka iwu Ụlọnsọ ukwu

2Ya mere, Devid nyere iwu ka a kpọkọta ndị ọbịa niile bi nʼIzrel, site nʼetiti ha ọ họpụtara ndị ga-edozi nkume a wara awa nke e ji wuo ụlọ Chineke. 3Devid wetara ọtụtụ igwe dị ukwuu, nke ha ji akpụta ǹtu maka ibo ọnụ ụzọ ama niile, na nke ịkpụ ihe njikọta niile. O wetakwara bronz a na-apụghị ịkọwa ịdị arọ ya. 4O webatakwara osisi sida nʼapụghị ịgụta ọnụọgụgụ ha, nʼihi na ndị Taịa na Saịdọn butere ha nʼọnụọgụgụ riri nne nye Devid.

5Mgbe ahụ, Devid kwuru, “Solomọn nwa m bụ nwantakịrị, onye na-amachabeghị ihe. Ma ụlọnsọ a ga-ewuru Onyenwe anyị ga-abụ ụlọ dị ukwuu, nke ga-enwe aha a ma ama, na nke mara ezi mma nʼanya mba niile dị nʼụwa. Nʼihi ya, aga m akpakọba ihe niile e ji ewu ya.” Ya mere, tupu Devid anwụọ, ọ kwakọtara ngwongwo riri nne.

6Ọ kpọrọ Solomọn, bụ nwa ya, nye ya iwu iwuru Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel ụlọ. 7Devid gwara Solomọn sị, “Nwa m, ọ dị m nʼobi
Maọbụ, ọ gụrụ m agụụ
iwu ụlọ maka aha Onyenwe anyị bụ Chineke m,
8ma okwu Onyenwe anyị ndị a ruru m ntị sị m, ‘Ị wụsịala ọtụtụ ọbara, bukwaa ọtụtụ agha. Ị gaghị ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị wụsịala ọtụtụ ọbara nʼelu ala nʼihu m. 9Ma ị ga-amụta otu nwa nwoke onye ga-abụ mmadụ udo, na onye ga-enwe izuike nʼoge ya. Aga m enye ya izuike site nʼaka ndị iro ya nʼakụkụ niile. Aha ya ga-abụ Solomọn. Aga m enye Izrel udo na ahụ dị jụụ nʼoge ọchịchị ya. 10Ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ ahụ. Ọ ga-abụrụ m nwa, mụ onwe m ga-abụkwara ya nna. Aga m emekwa ka ocheeze alaeze ya nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’

11“Ya mere, ugbu a nwa m, ka Onyenwe anyị nọnyere gị mgbe ị ga-ewu ụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, dịka o kwuru na ị ga-eme. 12Onyenwe anyị nyekwa gị amamihe na nghọta nke ị ga-eji chịa ezi ọchịchị mgbe ị ghọrọ eze Izrel, ka i si otu a debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị. 13Mgbe ahụ, ị ga-enwe ọganihu, ma ọ bụrụ na i lezie anya idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị nyere Mosis maka Izrel. Dị ike, nwee obi ike. Atụla ụjọ, maọbụ daa mba.

14“Ejisiela m ike chịkọtaa ihe maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, narị puku talenti ọlaedo na nde talenti ọlaọcha, na igwe, na bronz, nke a na-apụghị ịgụta ịdị arọ ha, na osisi, na nkume. I nwere ike itinyekwa ihe ndị ọzọ nʼime ha. 15Lee, i nwekwara ọtụtụ ndị ọrụ ndị na-awa nkume, na ndị na-edo nkume, na ndị ọka osisi, na ndị a maara aha ha nʼihe gbasara ǹka nʼọrụ dị iche iche, 16ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, ndị ọrụ nʼenweghị ọnụọgụgụ. Onyenwe anyị aghaghị ịnọnyere gị. Bilie, rụọ ọrụ dịịrị gị.”

17Devid nyere ndịisi Izrel iwu ka ha nyere nwa ya Solomọn aka, mgbe ọ ga-ewu ụlọ ahụ. 18Ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ na Onyenwe anyị Chineke anọnyereghị unu? Ọ bụ na o nyebeghị unu udo nʼakụkụ niile? Nʼihi na o nyela m mmeri nʼebe ndị iro m nọ. Ugbu a, ala a dịkwa nʼaka Onyenwe anyị na nʼaka ndị ya. 19Ya mere, tinyenụ obi unu na mmụọ unu nʼịgbaso Onyenwe anyị Chineke unu. Malitekwanụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke, ka unu nweekwa ike ibubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na ihe nsọ ndị ọzọ nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a ga-ewu nʼihi Aha Onyenwe anyị.”

Copyright information for IboBIU